16 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere eze ahu nke nānọkwasi n'oche-eze Devid, baye-kwa-ra ndi nka nile nke bi n'obodo a, bú umu-nne-unu ndi nēsoghi unu pua ije n'ala ọzọ ebe emere ka unu je biri;
17 otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, M'gaje iziga n'etiti ha mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe, M'gēme kwa ha ka ha di ka fig jọb͕uru onwe-ha, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha.
18 M'gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n'etiti mba nile ebe M'chugaworo ha:
19 n'ihi na ha egeghi nti okwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke M'zigara ha ndi-orùm, bú ndi-amuma, igwa ha, nēbili n'isi-ututu nēziga ha; ma unu egeghi nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
20 Ma unu onwe-unu, nurunu okwu Jehova, unu ndi nile emere ka unu je biri n'ala ọzọ, ndi M'zigara si na Jerusalem rue Babilon.
21 Okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere Ehab nwa Kolaia, baye-kwa-ra Zedekaia nwa Maaseia, ndi nēburu unu amuma ugha n'aham, si: Le, M'gaje inye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon; o gētib͕u kwa ha n'anya-unu;
22 agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n'ọku: