22 agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n'ọku:
23 n'ihi na ha emewo ihe-nzuzu n'Israel, we kwa nwunye ndikom-ibe-ha iko, kwu kwa okwu n'aham n'ugha, bú nke M'nēnyeghi ha n'iwu; ma Mu onwem bu onye mara, na onye-àmà; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
24 Ọzọ, okwu bayere Shemaia, bú onye-Nehelamait, ka i gēkwu, si,
25 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, N'ihi na gi onwe-gi ezigaworo ndi nka nile ndi bi na Jerusalem, ziga-kwa-ra Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà nile, akwukwọ n'aha-gi, si,
26 Jehova emewo gi onye-nchu-àjà n'ọnọdu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, ka ndi-nlekọta we di n'ulo Jehova, imeso onye ọ bula nāwi ara, nke nēme kwa onwe-ya onye-amuma, ka i we tiye ya n'ọtọsi na nime nkpọrọ olu.
27 Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka i nābasighi Jeremaia onye Anatot nba ike, onye nēme onwe-ya onye-amuma n'ebe unu nọ,
28 n'ihi na o ziteworo ayi ozi na Babilon, si, Mb͕e unu gēbi n'ala ọzọ di anya: wuenu ulo, biri; kuanu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha?