3 site n'aka Elasa nwa Shefan, na Gemaraia nwa Hilkaia, (ndi Zedekaia, bú eze Juda, zigara Nebukadneza, bú eze Babilon, rue Babilon,) si,
4 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri ndi nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi M'meworo ka eme ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:
5 Wuenu ulo, biri; kukwa-nu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha;
6 luanu nwunye, mua umu-ndikom na umu-ndinyom; lu-kwa-ranu umu-unu ndikom nwunye, lu-kwa-ranu umu-unu ndinyom di, ka ha we mua umu-ndikom na umu-ndinyom; ba-kwa-nu uba n'ebe ahu, ghara ibilata.
7 Chọ-kwa-nu udo nke obodo ahu nke M'meworo ka eme ka unu je biri n'ebe ahu, kpe-kwa-ranu Jehova ekpere bayere ya: n'ihi na n'udo-ya ka udo gādiri unu.
8 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu ekwela ka ndi-amuma-unu ndi nọ n'etiti unu, na ndi-unu ndi nāju arusi ase, rafue unu, unu ege-kwa-la nti nrọ nile unu nke unu onwe-unu nēme ka arọ ha.
9 N'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu n'aham: eziteghm ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.