8 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu ekwela ka ndi-amuma-unu ndi nọ n'etiti unu, na ndi-unu ndi nāju arusi ase, rafue unu, unu ege-kwa-la nti nrọ nile unu nke unu onwe-unu nēme ka arọ ha.
9 N'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu n'aham: eziteghm ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
10 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a.
11 N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.
12 Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti.
13 Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.
14 M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.