18 N'ubọchi ahu ulo Juda gējekuru ulo Israel, ha gāyikọ kwa bia site n'ala Ugwu rue ala ahu nke M'mere ka nna-unu-hà keta.
19 Ma Mu onwem siri, M'gēsi aṅa tiye gi n'etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M'we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n'isom laghachi azu.
20 N'ezie dika nwayi si ewere nghọb͕u rapu di-ya, otú a ka unu ghọb͕uworom, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
21 Olu ka anuru n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, bú ikwa-ákwá na aririọ-amara nile nke umu Israel; n'ihi na ha emewo ka uzọ-ha gbagọ, ha echezọwo Jehova, bú Chineke-ha.
22 Latanu, umu nke nādaghachi azu, M'gāgwọ ndaghachi-azu nile nke unu. Le ayi anya, ayi abiakutewo Gi; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke-ayi.
23 N'ezie n'efu ka nzọputa ahu bu nke anēle anya ya site n'ugwu ntà di iche iche, bú ìgwè madu n'elu ugwu nile: n'ezie na Jehova, bú Chineke-ayi, ka nzọputa Israel di.
24 Ma ihe-ihere ahu erichapuwo ihe putara na ndọb͕u nna-ayi-hà dọb͕uru onwe-ha n'ọlu site na mb͕e ayi di na nwata; ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom.