21 Ọzọ, onye-ebube nke Jekob gābu onye sitere na ya, onye nāchi ya gēsi kwa n'etiti ya puta; M'gēme kwa ka ọ biarue nso, o we biakutem nso: n'ihi na ònye ka onye a bu nke nọworo obi-ya mbé ibiakutem nso? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
22 Unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke.
23 Le, oké ifufe nke Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọ bu oké ifufe nke nēfechapu efechapu: n'isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike.
24 Iwe di ọku nke Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mesiri, ru kwa mb͕e O mesiri ka nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia ka unu gāghọta ya.