13 Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n'otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n'otù: n'ihi na M'gāb͕anwe oruru-újú-ha n'obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu.
14 M'gēme kwa ka afọ abuba jubiga nkpuru-obi ndi-nchu-àjà ókè, afọ ezi ihem gēju kwa ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
15 Otú a ka Jehova siri: Olu nime Rema ka anuru, bú abù-ákwá, na ikwa-ákwá nēlu ilu nke-uku, Rechel nākwara umu-ya ákwá; ọ juwo na agaghi-akasi ya obi bayere umu-ya, n'ihi na ha adighi.
16 Otú a ka Jehova siri: Jide olu-gi ka ọ ghara ikwa ákwá, jide kwa anya-gi abua ka ha ghara ib͕a anya-miri: n'ihi na ugwọ-ọlu di agākwu gi n'ọlu-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ha gēsi kwa n'ala onye-iro lata.
17 Olile-anya di-kwa-ra ọdi-n'iru-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); umu-gi gālata kwa n'ókè-ala-ha.
18 Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.
19 N'ezie mb͕e m'chigharisiri, m'we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m'mara, m'we tie aka n'apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n'ọnọdu-ihere, n'ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m'di na nwata.