Jeremaia 31:18-24 IGBOB

18 Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.

19 N'ezie mb͕e m'chigharisiri, m'we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m'mara, m'we tie aka n'apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n'ọnọdu-ihere, n'ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m'di na nwata.

20 Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

21 Me ka ogidi di iche iche iri uzọ ama guzoro onwe-gi ọtọ, doro onwe-gi ide di iche iche iri uzọ ama: tukwasi obi-gi n'uzọ ahu atuliri atuli, bú uzọ nke i jere ije nime ya: lata, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú israel, lata n'obodo-gi ndia.

22 Rùe ole mb͕e ka i ganēje iru na azu, gi ada nke nādaghachi azu? n'ihi na Jehova ekèwo ihe -ohu n'uwa, Nwanyi gānọ nwoke buruburu.

23 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ha gēkwu kwa okwu a ọzọ n'ala Juda, na n'obodo-ya nile, mb͕e m'gēme ka ndi-ya adọtara n.agha lata, si: Jehova gọzie gi, gi ebe-obibi nke ezi omume, gi ugwu nke idi-nsọ.

24 Juda na obodo-ya nile gēbikọ nime ya n'otù; ndi-ubi, na ndi nāchiri ìgwè aturu-ha bulie ije.