1 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti nke ub͕ò abua, mb͕e ya onwe-ya nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, si,
2 Otú a ka Jehova, bú Onye nēme ya, Jehova, bú Onye nākpu ya ime ka o guzosie ike, Onye Jehova bu aha-Ya, siri:
3 Kpọkuem, na M'gāza gi, gosi kwa gi ihe uku di iche iche, nke di kwa ike ighọta, nke i nāmaghi.
4 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere ulo nile nke obodo a, baye-kwa-ra ulo nile nke ndi-eze Juda, nke akwadaworo imegide obo-ihe nile atuliri atuli na imegide mma-agha, si: