13 N'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb, na n'ala Benjamin, na n'ebe nile nke di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, ka ìgwè ewu na aturu gāgabiga kwa ọzọ n'okpuru aka abua nke onye nāgu ha ọnu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
14 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ezi okwu ahu guzosie ike, bú nke M'gwaworo ulo Israel, nke M'kwuwo-kwa-ra bayere ulo Juda.
15 N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, ka M'gēme ka Ihe-opupú nke ezi omume puere Devid; ọ gēme kwa ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.
16 N'ubọchi ahu ka agāzọputa Juda, Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha nke agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.
17 N'ihi na otú a ka Jehova siri: Agaghi-ebipu n'ulo Devid onye nwe inọkwasi n'oche-eze ulo Israel;
18 ọzọ, agaghi-ebipu n'ulo ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, n'irum onye nwe isure àjà-nsure-ọku, na isure onyinye-inata-iru-ọma dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì, utọ, na ichu àjà ubọchi nile.
19 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,