10 ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n'ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha:
11 ma emesia ha chighariri, me ka ndi-orù-ha ndikom na ndinyom ndi nējere ha ozi, bú ndi ha zilagarari inwere onwe-ha, lata, ha we buda ha ka ha buru orù-ndikom na ndinyom nējere ha ozi:
12 okwu Jehova we rue Jeremaia nti site na Jehova, si,
13 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Mu onwem na nna-unu-ha b͕ara ndu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta, si,
14 N'ọgwugwu arọ asa unu gēzilaga, onye ọ bula nwa-nne-ya, bú onye-Hibru, nke rere onwe-ya n'aka-gi, we fè gi arọ isi, i gēzilaga ya inwere onwe-ya: ma nna-unu-hà egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala.
15 Unu onwe-unu we chigharia ta, we me ihe ziri ezi n'anyam abua, n'ikpọsa, onye ọ bula ọ gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya pua n'aka-gi; unu we b͕a ndu n'irum n'ulo nke akpọkwasiri aham:
16 unu we chigharia me ka aham ghara idi nsọ, me, onye ọ bula o me orù-ya nwoke, onye ọ bula o me nwanyi nke nējere ya ozi, ka ha lata, bú ndi unu zilagarari inwere onwe-ha n'ọchichọ nkpuru-obi-ha; unu we buda ha iburu unu orù-ndikom na ndinyom nējere unu ozi.