1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site Jehova n'ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,
2 Je n'ulo ndi Rikab, gwa ha okwu, me ka ha bata n'ulo Jehova, n'otù n'ime-ulo-ya, me ka ha ṅua manya-vine.
3 M'we kuru Jeazanaia nwa Jeremaia, nwa Habazinaia, na umu-nne-ya, na umu-ya ndikom nile, na ulo nile nke ndi Rikab;
4 m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ: