10 Ma Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ufọdu nime ndi Israel ndi nēnweghi ike, bú ndi nēnweghi ihe ọ bula, fọdu n'ala Juda, o we nye ha ubi-vine na ubi n'ubọchi ahu.
11 Nebukadreza, bú eze Babilon, we nye Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, iwu bayere Jeremaia, si,
12 Were ya, ka anya-gi abua di n'aru ya, eme-kwa-la ya ihe ọjọ ọ bula; kama dika ọ gēsi gwa gi, me ya otú a.
13 Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we ziga, ya na Nebushazban, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon;
14 ha we ziga, weputa Jeremaia n'ogige ulo-nche, nye ya n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka o we me ka ọ pua la: o we biri n'etiti ndi Israel.
15 Ọ bu kwa Jeremaia ka okwu Jehova ruru nti, mb͕e ọ nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, si,
16 Je, gwa Ebed-melek, bú onye Etiopia, okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka okwum nile biarue obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe; ha gādi kwa n'iru gi n'ubọchi ahu.