19 Ngiri-afọm, ngiri-afọm! anamab͕ali na mb͕idi nile nke obim; obim nāsu udè nke-uku nimem; adighm-ab͕a nkiti; n'ihi na olu opì-ike ka i nuworo, nkpuru-obim, bú udà-opì agha.
20 Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.
21 Rùe ole mb͕e ka m'gāhu ọkọlọtọ, nu olu opì-ike?
22 N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.
23 Ahurum uwa, ma, le, ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tob͕oro nkiti; ahu-kwa-ram elu-igwe, ma ìhè-ha adighi.
24 Ahurum ugwu, ma, le, ha nāma jijiji, ugwu ntà nile me-kwa-ra nkapatu.
25 Ahurum, ma, le, ọ dighi madu di, anu-ufe nile nke elu-igwe efelawo kwa.