Jeremaia 40:1-7 IGBOB

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, zilagasiri ya site na Rema, ka o weresiri ya mb͕e ọ bu onye ejiri nkpọrọ ke ab͕u n'etiti ndi Jerusalem na Juda nile ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi emere ka ha je biri na Babilon.

2 Onye-isi ndi-ob͕ū we were Jeremaia, si ya, Jehova, bú Chineke-gi, kwuru ihe ọjọ a megide ebe a:

3 Jehova we me ka ọ bia, O we me dika O kwuru; n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, ma unu egeghi nti olu-Ya, n'ihi nka ka ihe a ruworo unu aru.

4 Ma ub͕u a, le, atọpuwom i ta na nkpọrọ nke di n'aka-gi. Ọ buru na ọ di nma a'anya-gi isorom bia na Babilon, bia, anyam gādi kwa a'aru gi; ma ọ buru na ọ jọrọ njọ n'anya-gi isorom bia na Babilon, ghara: le, ala nka nile di n'iru gi; n'ebe di nma na n'ebe ziri ezi n'anya-gi ije, je n'ebe ahu.

5 Ma mb͕e ọ kālaghachighi, ọ si ya, Ma-ọbu laghachikuru Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye eze Babilon meworo onye-nlekọta obodo nile nke Juda, gi na ya biri n'etiti ndi-gi: ma-ọbu je ebe ọ bula ziri ezi n'anya-gi ije. Onye-isi ndi-ob͕ū we nye ya òkè ihe-oriri na onyinye, zilaga ya.

6 Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n'etiti ndi Israel ndi fọduru n'ala-ha.

7 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n'ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n'ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon;