1 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na Johanan nwa Karea, na Jezanaia nwa Hoshaia, na ndi Israel nile site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, we biarue nso,
2 si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:
3 ka Jehova, bú Chineke-gi, we gosi ayi uzọ ahu nke ayi gēje ije nime ya, na ihe ayi gēme.
4 Jeremaia, bú onye-amuma, we si ha, Anuwom; le, m'gaje ikpere Jehova, bú Chineke-unu, ekpere, dika okwu nile nke unu si di; ọ gēru kwa na ihe ọ bula nke Jehova gāza unu, m'gēgosi unu ya; m'gaghi-eb͕ochinari unu ihe ọ bula.