19 Jehova ekwuwo okwu bayere unu, unu ndi Juda fọduru, si, Unu abàla n'Ijipt: maranu nke-ọma na ab͕aworom unu àmà ta.
20 N'ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n'ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya:
21 m'we gosi unu ya ta; ma unu egeghi nti n'olu Jehova, bú Chineke-unu, ọbuná ime ihe ọ bula nke O zìrim ka m'were ya biakute unu.
22 Ma ub͕u a maranu nke-ọma na ọ bu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, ka unu gānwu n'ebe ahu nke ọ nātọ unu utọ ije nọ dika ọbìa n'ebe ahu.