4 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na ndi Israel nile, we ghara ige nti olu Jehova, ibi n'ala Juda.
5 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, we chiri ndi Juda nile fọduru, bú ndi siri na mba nile ebe achugara ha-ri lata inọ dika ọbìa n'ala Juda;
6 bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na umu-ndinyom eze, na madu ọ bula nke Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ọ nọdu n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, na Jeremaia, bú onye-amuma, na Beruk nwa Neraia;
7 ha we ba n'ala Ijipt; n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ha we biarue Tahpanhes.
8 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti na Tahpanhes, si,
9 Were nkume di uku n'aka-gi, zobe ha n'urọ n'ebe ahu anākpu brick nke di n'ọnu-uzọ ulo Fero na Tahpanhes, n'anya ndi Juda;
10 si ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iziga kuru Nebukadreza, eze Babilon, bú orùm, dọkwasi oche-eze-ya n'elu nkume ndia nke m'zobeworo; ọ gēseti kwa ulo-ǹdò-ya n'elu ha.