1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi-Ju nile ndi bi n'ala Ijipt, ndi bi na Migdol, na nime Tahpanhes, na nime Nof, na n'ala Patros, si,
2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu onwe-unu ahuwo ihe ọjọ ahu nile nke M'meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, biakwasi kwa obodo nile nke Juda; ma, le, ha bu nkpọnkpọ ebe ta, ọ dighi kwa onye bi nime ha;
3 n'ihi ihe ọjọ ha nke ha meworo ikpasum iwe, n'ije isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ifè chi ọzọ di iche iche, ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha, ma-ọbu unu onwe-unu, ma-ọbu nna-unu-hà.
4 M'we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha, si, Biko, unu emela ihe-árú a nke M'kpọworo asì.
5 Ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n'ala isi n'ihe ọjọ ha chigharia, ighara isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
6 Ewe wusi ọnumam na iwem, o we re ọku n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem; ha we ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika o si di ta.