22 Olu-ya di ka mkpatu agwọ mb͕e ọ nāga; n'ihi na ha gāchiri usu-ndi-agha je ije, ha achiriwo kwa anyu-ike biakute ya, dika ndi-ọwa-nkú.
23 Ha gēb͕utu oké ọhia-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na agaghi-eleputa ya; n'ihi na ha di ọtutu kari igurube, ha adighi kwa ọnu-ọgugu.
24 Agēme ka ihere me ada Ijipt; agēnye ya n'aka ndi Ugwu.
25 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi:
26 M'gēnye kwa ha n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-orù-ya: ma emesia agēbi ya, dika o si di n'ubọchi nile nke mb͕e ochie; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
27 Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru mgbū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.