1 Nke diri Moab. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ahuhu diri Nebo! n'ihi na emebiwo ya; emewo ka ihere me Kiriataim, ewerewo ya: emewo ka ihere me Misgab, ọ nātu kwa ujọ.
2 Ọ dighi kwa otuto Moab di ọzọ; nime Heshbon ka ha chèputara èchìchè ọjọ megide ya, si, Bianu, ka ayi bipu ya ka ọ ghara ibu mba. Gi Madmen, agēme kwa ka i dere du; gi ka mma-agha gējeso.
3 Ge nti olu iti-nkpu nke siri na Horonaim puta, ọ bu ipunara-madu-ihe na ntikpọ uku!
4 Etikpọwo Moab; ndi-ntà-ya emewo ka anuru iti-nkpu.
5 N'ihi na nrigo Luhit ka o ji ikwa-ákwá nārigo nākwa ákwá; n'ihi na nime nrida Horonaim ka ha nuworo nkpà nke iti-nkpu nke ntikpọ.
6 B͕alaganu, wepuganu onwe-unu, di-kwa-nu ka osisi tamarisk n'ọzara.