20 N'ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Edom; na èchìchè-Ya nile, nke O chèworo megide ndi bi na Timan, si: N'ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu; n'ezie o gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha.
21 Site n'olu nke ọdida-ha uwa mara jijiji; iti-nkpu di, n'Oké Osimiri Uhie ka anuru olu-ya.
22 Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n'elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.
23 Nke diri Damaskọs. Ihere emewo Hemat na Apad; n'ihi na akukọ ọjọ ka ha nuworo, ha ab͕azewo: n'oké osimiri ka ncheb͕u di; ọ pughi inọ jū.
24 Damaskọs aghọwọ onye-ume-ngwu, o lewo anya n'azu ib͕alaga, ọma-jijiji ejidewo kwa ya: nkpà na ihe-nb͕u di iche iche ejidesiwo kwa ya ike, dika nke nwanyi ime nēme.
25 Èsi aṅa ghara irapu obodo nke otuto, bú obodo nke obi-utọm?
26 N'ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n'amá-ya nile, ọ bu kwa ndi-agha-ya nile ka agēme ka ha dere du n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.