22 Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n'elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.
23 Nke diri Damaskọs. Ihere emewo Hemat na Apad; n'ihi na akukọ ọjọ ka ha nuworo, ha ab͕azewo: n'oké osimiri ka ncheb͕u di; ọ pughi inọ jū.
24 Damaskọs aghọwọ onye-ume-ngwu, o lewo anya n'azu ib͕alaga, ọma-jijiji ejidewo kwa ya: nkpà na ihe-nb͕u di iche iche ejidesiwo kwa ya ike, dika nke nwanyi ime nēme.
25 Èsi aṅa ghara irapu obodo nke otuto, bú obodo nke obi-utọm?
26 N'ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n'amá-ya nile, ọ bu kwa ndi-agha-ya nile ka agēme ka ha dere du n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
27 M'gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad.
28 Nke diri Kida, di-kwa-ra ala-eze nile nke Hezoa, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru.Otú a ka Jehova siri: Bilienu, rigorue Kida, punara umu Iru-anyanwu ihe-ha.