13 ndi-amuma gāghọ kwa ifufe, okwu-Ya adighi kwa nime ha: otú a ka agēme ha.
14 N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ji si otú a, N'ihi unu nēkwu okwu a, le, anameme okwum nke di n'ọnu-gi ka ha ghọ ọku, anameme kwa ka ndi ghọ nkú, ọ gērichapu kwa ha.
15 Le, anameme ka otù mba si n'ebe di anya biakwasi unu, ulo Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta:) mba di ike ka ọ bu, mba nke sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka ọ bu, ọ bu mba nke i nādighi-ama asusu-ya, nke I nādighi-anu kwa ihe ha nēkwu.
16 Àkpà-àkú-ha di ka ílì ghere oghe, ha nile bu ndi-dike.
17 Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.
18 Ma ọbuná n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-eme ka unu gwusia.
19 Ọ gēru kwam mb͕e unu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova, bú Chineke-ayi, meworo ayi ihe nile ndia? na i gāsi ha, Dika unu rapurum, we fè chi di iche iche nke ala ọzọ n'ala-unu, otú a ka unu gēfè ndi ala ọzọ n'ala nābughi nke unu.