33 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ndi emeb͕uru emeb͕u ka umu Israel na umu Juda bu n'otù: ndi nile dọtaworo ha n'agha ejidesiwo ha ike; ha ajuwo izilaga ha.
34 Onye-nb͕aputa-ha di ike; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: Ọ gēkpezu ọnu-ha, ka O we me ka uwa doro aru ala, me kwa ka ndi bi na Babilon me nkpatu.
35 Mma-agha di n'aru ndi Kaldea, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na n'ebe ndi bi na Babilon nọ, na n'ebe ndi-isi-ya nọ, na n'ebe ndi-ya mara ihe nọ.
36 Mma-agha di n'ebe ndi-ekwukwu nọ, ha gāghọ ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha: mma-agha di n'ebe ndi-dike-ya nọ, ha gātu kwa ujọ.
37 Mma-agha di n'ebe inyinya-ya nile di, na n'ebe ub͕ọ-ala-ya di, na n'ebe ndi nile gwara ọgwa nọ, bú ndi nọ n'etiti ya, ha gāghọ kwa ndinyom: mma-agha di n'ebe àkù-ya nile di, agāluta kwa ha n'agha.
38 Ọkpukpọ-nku di n'ebe miri-ya nile di, ha gāta kwa ata: n'ihi na ala arusi di iche iche apiri api ka ọ bu, ha ji kwa ihe-egwu nile ha wi ara.
39 N'ihi nka ka anu-ọhia di iche iche nke bi n'ala kpọrọ nku gēbi n'ebe ahu, ha na anu-ọhia nke nēbe ebe, enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu: madu agaghi-ebi kwa nime ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ gaghi-abu kwa ebe-obibi rue ọb͕ọ nile.