37 Mma-agha di n'ebe inyinya-ya nile di, na n'ebe ub͕ọ-ala-ya di, na n'ebe ndi nile gwara ọgwa nọ, bú ndi nọ n'etiti ya, ha gāghọ kwa ndinyom: mma-agha di n'ebe àkù-ya nile di, agāluta kwa ha n'agha.
38 Ọkpukpọ-nku di n'ebe miri-ya nile di, ha gāta kwa ata: n'ihi na ala arusi di iche iche apiri api ka ọ bu, ha ji kwa ihe-egwu nile ha wi ara.
39 N'ihi nka ka anu-ọhia di iche iche nke bi n'ala kpọrọ nku gēbi n'ebe ahu, ha na anu-ọhia nke nēbe ebe, enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu: madu agaghi-ebi kwa nime ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ gaghi-abu kwa ebe-obibi rue ọb͕ọ nile.
40 Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.
41 Le, otù ndi nēsi n'Ugwu bia; ọzọ, mba uku na ọtutu ndi-eze ka agākpọte site na nsọtu nile nke uwa.
42 Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ha bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕ọ dika oké osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Babilon.
43 Eze Babilon anuwo ùdé-ha, aka-ya abua we kuda: ihe-nb͕u ejidewo ya, ihe-nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme.