5 Ha gāju ajuju uzọ isi je Zaion, nēche iru-ha n'ebe a, si, Bianu, were onwe-unu rapara n'aru Jehova n'ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nke anāgaghi-echezọ echezọ.
6 Ìgwè ewu na aturu nāla n'iyì ka ndim buworo: ndi-ọzùzù-aturu-ha emewo ka ha kpafue, n'ugwu di iche iche ka ha meworo ka ha laghachi azu: site n'ugwu rue ugwu ntà ka ha jeworo, ha echezọwo ebe-nmakpu-ha.
7 Ndi nile ndi nāchọputa ha eripiawo ha: ndi nākpab͕u ha siri, Ikpe amaghi ayi, n'ihi na ha emehiewo megide Jehova, bú ebe-obibi nke ezi omume, na olile-anya nke ndi bu nna-ha, bú Jehova.
8 Sinu n'etiti Babilon wagharia, si-kwa-nu n'ala ndi Kaldea pua, di-kwa-nu ka nkpi n'iru ìgwè ewu na aturu.
9 N'ihi na, le, Mu onwem gaje ikpọte me ka nkpọkọta mba uku di iche iche si n'ala Ugwu rigoputa imegide Babilon: ha gēdo kwa onwe-ha n'usoro megide ya; agēsi n'ebe ahu were ya: àkú nke usu ahu gādi ka nke dike nke bu ọ̀kà-uta; ọ gaghi-alaghachi azu n'efu.
10 Kaldea gāghọ kwa ihe-nkwata: afọ gēju ndi nile ndi nākwata ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
11 N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;