20 Anyu-ike-agha ka i burum na ihe-agham nile; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia mba di iche iche; ọ bu kwa gi ka M'gēji bibie ala-eze di iche iche;
21 ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia inyinya na onye nānọkwasi ya; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia ub͕ọ-ala na onye nānọkwasi ya;
22 ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwoke na nwanyi; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia agadi-nwoke na nwa-okoro; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwa-okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke;
23 ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia onye-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ya; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia onye-ọlu-ubi na ehi-ya ejikọrọ abua abua; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze.
24 M'gākwughachi kwa Babilon, kwughachi kwa ndi nile bi na Kaldea, ihe ọjọ nile ha nke ha meworo nime Zaion n'anya-unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
25 Le, Mu nēmegide gi, gi ugwu nēbibi ebibi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke nēbibi uwa nile: M'gēseti kwa akam imegide gi, kpọreda gi site na nkume-gi nile di elu, mee ka i ghọ ugwu esurere esure.
26 Ha agaghi-eweputa nime gi otù nkume ido na nkuku-ulo, ma-ọbu otù nkume itọ ntọ-ala; n'ihi na ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka i gābu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.