31 O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o weliri isi Jehoiakin, bú eze Juda, me ka o si n'ulo-nkpọrọ puta;
32 o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon.
33 O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, o we nēri nri n'iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya.
34 Anēnye kwa ya òkè-ihe-oriri-ya, bú òkè-ihe-oriri mb͕e nile, site n'aka eze Babilon, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya rue ubọchi ọnwu-ya, ubọchi nile nke ndu-ya.