1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,
2 Guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova, we kpọsa okwu a n'ebe ahu, si, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile, ndi nābà n'ọnu-uzọ-ama ndia ikpọ isi ala nye Jehova.
3 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Menu ka uzọ nile nke unu na omume nile nke unu di nma, M'gēme kwa ka unu biri n'ebe a.
4 Unu atukwasila obi-unu n'okwu-ugha nile, si, Ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ka ndi a bu.
5 N'ihi na ọ buru na unu eme ka uzọ nile unu na omume nile unu dizue nma; ọ buru na unu emezue ihe ekpere n'ikpe n'etiti otù onye na ibe-ya;