13 M'gēkpochapusi ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-vine adighi n'osisi vine, ọ dighi fig di n'osisi fig, akwukwọ akpọnwuwo kwa; M'we doro ha ndi nāgabiga ha n'isi.
14 N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nānọdu ala? chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba n'obodo nile ewusiri ike, we debe ọnu-ayi du n'ebe ahu: n'ihi na Jehova, bù Chineke-ayi, emewo ka ayi debe ọnu-ayi du, O mewo kwa ka ayi ṅua miri ńsí, n'ihi na ayi emehiewo megide Jehova.
15 Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwọ, ma le, oké egwu.
16 Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n'olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya.
17 N'ihi na, le, M'ganēzite agwọ, bú ubí, n'etiti unu, nke ọ nādighi urà agārà ha; ha gāta kwa unu aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
18 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n'arum ka aru nādighi obim ike.
19 Le, ọ bu olu ntiku nke ada ndim site n'ala di anya nke-uku: Jehova, Ọ̀ nọghi na Zaion? Eze-ya, Ọ̀ nọghi nime ya? Gini mere ha ji were arusi nile ha apiri api, were kwa ihe-efu nile nke onye ala ọzọ, kpasuem iwe?