5 Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n'ihi manya utọ; n'ihi na ebipuwo ya n'ọnu-unu.
6 N'ihi na otù mba arigokwasiwo n'alam, o nwere ume, nādighi kwa ọnu-ọgugu; ezé-ya nile di ka ezé ọdum, o nwe-kwa-ra ikiri-ezé nke nne-ọdum.
7 O mewo ka osisi vine nkem ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, o mewo ka osisi fig nkem ghọ irighiri-osisi: o kpechapusiwo nb͕ub͕ọ-ya, kpofue ya; emewo ka alaka-ya nile di ọcha.
8 Kwa ákwá dika nwa-ab͕ọghọ nke ekeworo ákwà-nkpe n'ihi di o nwere na nwata.
9 Ebipuwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Jehova; ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, eruwo újú.
10 Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n'ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo.
11 Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n'ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n'iyì.