4 Mu onwem we si, Achupuwom n'iru anya-Gi abua;Otú ọ di, m'gēlegide kwa anya ọzọ n'ebe ulo uku Gi di nsọ di.
5 Miri b͕aram buruburu, rue nkpuru-obi;Ob͕u-miri dim buruburu;Achara-miri kukurum n'isi.
6 Rue ala ugwu nile ka m'ridara;Ala, ihe-ntuchi-ya nile kpachitaram rue mb͕e ebighi-ebi:Ma I mewo ka ndum si n'olùlù rigoputa, Jehova, bú Chinekem.
7 Mb͕e nkpuru-obim nēnweghi ike nimem, Jehova ka m'chetara:Ekperem we bakute Gi, ba n'ulo uku Gi di nsọ.
8 Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama,Ebere-ha ka ha nārapu.
9 Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà;Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi.Nzọputa diri Jehova.
10 Jehova we gwa azù ahu okwu, o we b͕ọputa Jona n'ala-akọrọ.