1 Okwu Jehova we rue Jona nti nke ub͕ò abua, si,
2 Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku ahu, kpọsara ya nkpọsa ahu nke Mu onwem nāgwa gi.
3 Jona we bilie, jerue Nineve, dika okwu Jehova si di. Ma Nineve bu obodo di uku ri nne, ije nke ubọchi atọ.
4 Jona we malite ibà n'obodo ije nke otù ubọchi, o we kpọsa, si, Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve.
5 Ndi Nineve we kwere na Chineke; ha we kpọsa obubu-ọnu, yiri ákwà-nkpe, site n'onye uku ha we rue onye ntà ha.
6 Okwu ahu we rute eze Nineve aru, ọ we si n'oche-eze-ya bilie, yipu uwe-nwuda-ya n'aru ya, kpuchie onwe-ya n'ákwà-nkpe, nọkwasi na ntu.
7 O we tie nkpu, kwusa nime Nineve site n'iwu eze na ndi uku ya, si, Ka madu na anumanu, ma ìgwè ehi ma ìgwè ewu na aturu, ghara idetu ihe ọ bula n'ọnu: ka ha ghara izù onwe-ha, ghara kwa iṅu miri: