7 O we tie nkpu, kwusa nime Nineve site n'iwu eze na ndi uku ya, si, Ka madu na anumanu, ma ìgwè ehi ma ìgwè ewu na aturu, ghara idetu ihe ọ bula n'ọnu: ka ha ghara izù onwe-ha, ghara kwa iṅu miri:
8 ma ka ha kpuchie onwe-ha n'ákwà-nkpe, ma madu ma anumanu, ka ha kpọkusi kwa Chineke ike: ka ha chighari kwa, onye ọ bula ya pua n'uzọ ọjọ ya, na n'ihe-ike nke di n'ọbu-aka-ha.
9 Ònye mara? eleghi anya Chineke gēchighari, chègharia uche, si n'iwe-Ya di ọku chigharia, ka ayi we ghara ila n'iyì.
10 Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n'uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.