1 O rue, mb͕e ọnwu Moses, bú orù Jehova, gasiri, na Jehova gwara Joshua nwa Nun, bú onye nējere Moses ozi, okwu, si,
2 Moses, bú orùm anwuruwo; ma ub͕u a bilie, gabiga Jọdan nka, gi onwe-gi, na ndi nke a nile, rue ala ahu nke Mu onwem nēnye ha, bú umu Israel.
3 Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi, unu ka M'nyeworo ya, dika M'gwara Moses okwu.
4 Site n'ọzara, na Lebanon nka, we rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis, ala nile nke ndi Het, we rue oké osimiri chere iru n'ọdida-anyanwu, ka ókè-ala unu gādi.
5 Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi: M'gaghi-ara gi aka, M'gaghi-arapu kwa gi.
6 Idi ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka ndi nka keta ala ahu nke M'ṅuru nna-ha iyi inye ha.