9 Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.
10 Joshua we nye ndi-ọchi-agha ndi Israel iwu, si,
11 Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.
12 Joshua gwa-kwa-ra ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, okwu, si,
13 Chetanu okwu ahu nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, si, Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu zuru ike, Ọ gēnye kwa unu ala nka.
14 Ndinyom-unu na umu-ntakiri-unu na anu-ulo-unu gānọdu n'ala ahu nke Moses nyere unu n'ofè Jọdan; ma unu onwe-unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, chiri ihe-ekike-agha, ndi-dike nile, bú dìnkpà, unu gēye-kwa-ra ha aka;
15 rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O meworo unu, ha we nweta, ọbuná ha onwe-ha, ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha: unu we laghachi n'ala nke ihe-nnweta-unu, we nweta ya, bú nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu.