10 Jehova we chusa ha n'iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n'uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda.
11 O rue, mb͕e ha si n'iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n'elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue.
12 Mb͕e ahu Joshua gwara Jehova okwu n'ubọchi Jehova rara ndi-Amorait nye n'iru umu Israel; o we si n'anya Israel,Anyanwu, guzo du n'elu Gibeon;Gi Ọnwa kwa, na ndagwurugwu Ajalon.
13 Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra,Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha.Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu.
14 Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha.
15 Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.
16 Eze ise ndia we b͕alaga, zo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.