13 Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra,Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha.Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu.
14 Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha.
15 Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.
16 Eze ise ndia we b͕alaga, zo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.
17 Ewe gosi Joshua, si, Achọtawo eze ise ahu, ha ezowo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.
18 Joshua we si, Kpọrenu nkume uku rue ọnu ọb͕à ahu, do kwa ndikom n'elu ya dika ndi-nlekọta idebe ha:
19 ma unu onwe-unu eguzola; nāchunu ndi-iro-unu n'azu, tib͕u kwa ndi-ikpe-azu n'etiti ha; unu ekwela ka ha ba n'obodo di iche iche ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, enyewo ha n'aka-unu.