1 O rue, mb͕e Jebin, bú eze Hezoa, nuru ya, na o zigara Jobab, bú eze Madon, ziga-kwa-ra eze Shimron, ziga-kwa-ra eze Akshaf,
2 ziga-kwa-ra ndi-eze ndi nọ n'Ugwu, bú n'ugwu, na n'Araba nke di na Ndida Kinerot, na n'ebe di ala ala, na n'ebe nile di elu nke Doa n'Ọdida-anyanwu, ozi;
3 o zigara ndi Kenean n'Ọwuwa-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus n'ugwu, na ndi-Haivait n'okpuru Heamon n'ala Mizpa.
4 Ha we puta, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile tiyere ha, bú ndi bara uba, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba, ha na inyinya na ub͕ọ-ala bara uba nke-uku.