20 N'ihi na o sitere n'aka Jehova ime ka obi-ha di ike, izute Israel n'agha, ka O we wezuga ha ka ebibie ha, ka ha we ghara inwe amara, kama ka O we kpochapu ha, dika Jehova nyere Moses iwu.
21 Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n'ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n'Anab, na n'ugwu Juda nile, na n'ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha.
22 Ọ dighi ndi Anak fọduru n'ala umu Israel; nání nime Geza, na nime Gat, na n'Ashdod, ka ha fọduru.
23 Joshua we were ala ahu nile, dika okwu nile si di nke Jehova gwara Moses; Joshua we nye ya Israel ka ọ buru ihe-nketa, dika esi kè ha n'òkè n'òkè dika ebo nile ha si di. Ala ahu we rapu ibu-agha, di jū.