13 Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n'etiti umu Israel, rue ta.
14 Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu.
15 Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di.
16 Ókè-ala ha nwere we di site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n'akuku Medeba;
17 Heshbon, na obodo-ya nile nke di n'ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon;
18 na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat;
19 na Kiriataim, na Sibma, na Zeret-shaha n'ugwu ndagwurugwu ahu;