16 Ókè-ala ha nwere we di site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n'akuku Medeba;
17 Heshbon, na obodo-ya nile nke di n'ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon;
18 na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat;
19 na Kiriataim, na Sibma, na Zeret-shaha n'ugwu ndagwurugwu ahu;
20 na Bet-peoa, na nkpọrube nile nke Pisga, na Bet-jeshimot;
21 na obodo nile nke ala di lari, na ala-eze nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, onye Moses tib͕uru, ya na ndi-isi Midian, bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, ndi bu ndi-isi nke Saihon, ndi bi n'ala ahu.
22 Umu Israel were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa, bu onye nāju ase, n'etiti ndi ha b͕uru.