24 Moses we nye ebo Gad, bú umu Gad, dika ab͕uru nile ha si di.
25 Ókè-ala-ha we buru Jeza, na obodo nile nke Gilead, na nkera ala umu Amon, rue Aroea nke di n'iru Raba;
26 site kwa na Heshbon rue Remat-mizpe, na Betonim; site kwa na Mahanaim rue ókè-ala Debia;
27 na nime ndagwurugwu ahu, Bet-heram, na Bet-nimra, na Sukot, na Zafon, bú nke fọduru nke ala-eze Saihon, bú eze Heshbon, Jọdan na ókè-ala-ya, rue nsọtu oké osimiri Kineret n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu.
28 Nka bu ihe-nketa umu Gad dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha.
29 Moses we nye nkera ebo Manase ihe-nketa: ọ we diri nkera ebo umu Manase dika ab͕uru nile ha si di.
30 Ókè-ala-ya we di site na Mahanaim, Beshan nile, ala-eze nile nke Og, bú eze Beshan, na ebe-obibi nile nke Jaia, nke di na Beshan, ọgu obodo atọ: