8 Ndi Reuben na ndi Gad soro ya nara ihe-nketa-ha, nke Moses nyere ha, n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, dika Moses, bú orù Jehova, nyere ha;
9 site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke Medeba rue Dibon;
10 na obodo nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, rue ókè-ala umu Amon;
11 na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka;
12 ala-eze nile nke Og nime Beshan, onye buri eze n'Ashtarot na n'Edrei (onye ahu fọduru site na ndi fọduru nke Refaim); Moses we tib͕ue ha, napu ha ala-ha.
13 Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n'etiti umu Israel, rue ta.
14 Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu.