4 N'ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n'ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara.
5 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu Israel mere, ha we kè ala ahu.
6 Umu Juda we biarue nso Joshua nime Gilgal: Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, we si ya, Gi onwe-gi amawo okwu Jehova gwara Moses, bú onye nke Chineke, bayerem, baye-kwa-ra gi, nime Kedesh-banea.
7 Ọgu arọ abua ka m'b͕ara mb͕e Moses, bú orù Jehova, si na Kedesh-banea zipum iledo ala nka; m'we weghachiri ya okwu dika o si di n'obim.
8 Ma umu-nnem ndi mu na ha rigoro mereka obi lọ ndi Israel miri: ma mu onwem sozuru Jehova, bú Chinekem, n'azu.
9 Moses we ṅua iyi n'ubọchi ahu, si, Ala nke i zọkwasiri ukwu aghaghi iburu gi na umu-gi ihe-nketa rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na i sozuwo Jehova, bú Chinekem, n'azu.
10 Ma ub͕u a, le, Jehova emewo ka m'di ndu, dika O kwuru, ọgu arọ abua na ise ndia, site na mb͕e Jehova gwara Moses okwu a, mb͕e Israel jere ije n'ọzara: ma ub͕u a, le, mu onwem b͕ara ọgu arọ anọ na ise ta.