42 Libna, na Eta, na Ashan;
43 na Ifta, na Ashna, na Nezib;
44 na Keila, na Akzib, na Marisha; obodo iteghete na obodo ntà ha.
45 Ekron, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile:
46 site n'Ekron we rue oké osimiri, obodo nile nke di n'akuku Ashdod, na obodo ntà ha.
47 Ashdod, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; Geza, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; rue miri-iyi Ijipt, na oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya.
48 N'ugwu kwa, Shamia, na Jatia, na Soko;