1 Ife-nzà nke mara umu Josef siri na Jọdan pua Jeriko, na miri Jeriko n'ọwuwa-anyanwu, bú ọzara ahu, nēsi na Jeriko rigo n'ugwu rue Bet-el;
2 o si na Bet-el pua rue Luz, gabiga rue ókè-ala ndi-Akait rue Atarot;
3 ọ rida n'akuku Ọdida-anyanwu rue ókè-ala ndi-Jafletait, rue ókè-ala Bet-horon di n'okpuru, rue Gezea: ọpupu-ya we di n'oké osimiri.
4 Umu Josef, bú Manase na Efraim, we keta nke ha.