21 na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez:
22 ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha.
23 Nka bu ihe-nketa ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo ahu na obodo ntà ha.
24 Ife-nzà nke-ise we putara ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di.
25 Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf;
26 na Alamelek, na Amad, na Mishal; ọ metu Kamel n'akuku Ọdida-anyanwu, metu kwa Shaihoa-libnat;
27 ọ we chigharia n'ọwuwa-anyanwu rue Bet-degon, we metu Zebulun, metu kwa ndagwurugwu Ifta-el n'akuku Ugwu rue Bet-emek na Neiel; ọ pua rue Kabul n'aka-ekpe,