36 na Adama, na Rema, na Hezoa;
37 na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa;
38 na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha.
39 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha.
40 Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara.
41 Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh;
42 na Shaalabin na Ajalon, na Itla;